1 N'akuku osimiri nile nke Babilon,N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá,Mb͕e ayi chetara Zaion.
2 N'osisi willow di n'etiti yaKa ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi.
3 N'ihi na n'ebe ahu ka ndi nādọta ayi n'agha riọro n'aka-ayi okwu abù,Ndi lutara ihe-ayi n'agha riọ-kwa-ra ayi ka ayi ṅuria ọṅu, si,Bùaranu ayi otù nime abù Zaion.
4 Àyi gēsi aṅa bù abù JehovaN'ala nke onye ala ọzọ?