19 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke:Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu.
20 Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ,Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu.
21 Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì?Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi?
22 Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì:Ndi-iro ka ha burum.
23 Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim:Nānwam, we mara iche-uchem nile: