4 N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem,Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.
5 N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum.
6 Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube;Ọ dika elu, apughm iru ya.
7 Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi?Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?
8 Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ:Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu.
9 Ọ buru na achirim nkù nke ututu,Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,
10 Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum,Aka-nri-gi gējidekwam.