9 Ọ buru na achirim nkù nke ututu,Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,
10 Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum,Aka-nri-gi gējidekwam.
11 M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim;Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.
12 Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi;Ma abali nēnye ìhè dika ehihie:Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi
13 N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua:I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.
14 M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu:Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di;Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.
15 Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi,Mb͕e emerem na nzuzo,Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.