1 Olum ka m'ji etiku Jehova;Olum ka m'ji ariọ Jehova aririọ-amara.
2 Anamekwuwa okwu ntamum n'iru Ya;Ahuhum ka m'nēgosi n'iru Ya.
3 Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm.N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.
4 Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam:Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.
5 Etikurum I, Jehova;Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm,Na òkèm n'ala ndi di ndu.