3 N'ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim;Ọ zọpiawo ndum n'ala:O mewom ka m'biri n'ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.
4 Mọm we ghara inwe ike nimem;Ibobo nānwu obim nimem.
5 Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie;Atughariwom uche n'omume-Gi nile:N'ọlu aka-Gi abua ka m'tughariworo obi.
6 Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ:Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ. Selah
7 Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo:Ezonarilam iru-Gi;Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.
8 Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu;N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi:Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya;N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.
9 Naputam n'aka ndi-irom, Jehova:N'ebe I nọ ka m'kpuchiworo onwem.