1 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu,Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù:Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:
2 Eberem, na ebem ewusiri ike,Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu;Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya;Onye nāzọda ndim n'okpurum.
3 Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?
4 Madu yiri otù nku-umeUbọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.
5 Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.
6 Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.