5 Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.
6 Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.
7 Si n'elu setipu aka-Gi;Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri,N'aka ndi ala ọzọ;
8 Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.
9 Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi:Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma.
10 Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa:Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.
11 Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ,Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.