1 Tonu Ja;N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma;N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.
2 Jehova nēwuli Jerausalem elu;Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.
3 Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu,Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.
4 Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando;Ha nile ka Ọ nākpọ aha.