10 Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.
11 Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,Ndi nēchere ebere-Ya.
12 Gi Jerusalem, nāja Jehova;To Chineke-gi, Zaion.
13 N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.
14 Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.
15 Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.
16 Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.