14 Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.
15 Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.
16 Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.
17 Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?
18 Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.
19 Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.