1 Tonu Ja.Tonu Jehova site n'elu-igwe:Tonu Ya n'ebe di elu.
2 Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile:Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.
3 Tonu Ya, anyanwu na ọnwa:Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.
4 Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe,Na miri nke di n'elu elu-igwe.
5 Ka ha to aha Jehova:N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.