3 Tonu Ya, anyanwu na ọnwa:Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.
4 Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe,Na miri nke di n'elu elu-igwe.
5 Ka ha to aha Jehova:N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.
6 O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi:Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.
7 Tonu Jehova site n'uwa,Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:
8 Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:
9 Ugwu nile na ugwu ntà nile;Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile: