8 Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:
9 Ugwu nile na ugwu ntà nile;Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:
10 Anu-ọhia na anu-ulo nile;Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:
11 Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche;Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:
12 Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ;Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:
13 Ka ha too aha Jehova;N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya:Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.