1 Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.
2 Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu:Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru.
3 Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa,Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:
4 Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova:M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara,M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum.