1 Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum;Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe.
2 Ka ikpém si n'iru Gi puta;Anya-Gi nāhu izi-ezi.
3 I nwawo obim; I letawom n'abali;I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe;Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè.
4 Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-GiKa mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya.
5 Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile,Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha.
6 Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke:Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum.