6 Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke:Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum.
7 Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime GiSite n'iru ndi nēbili imegide ha.
8 Debem dika nwa-anya-Gi,Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi,
9 Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe,Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu.
10 Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba:Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.
11 Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi:Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala.
12 Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike,Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo.