38 Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ:Ha nāda n'okpuru ukwum abua.
39 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
40 Ndi-irom, I nyewokwam olu-haNdi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
41 Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha:Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha.
42 Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe:Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.
43 I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdom onye-isi mba nile ọzọNdi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.
44 Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti:Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.