1 Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke;Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi.
2 Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba,Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma.
3 Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di;Anughi olu-ha.
4 N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue,Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.