3 Ka ayi tijie ab͕u nile ha,Tufue udọ̀ nile ha n'aru ayi.
4 Onye nānọdu n'elu-igwe nāchi ọchì:Onye-nwe-ayi nākwa ha emò.
5 Mb͕e ahu Ọ gāgwa ha okwu n'iwe-Ya,Ọ bu kwa n'iwe-Ya di ọku ka Ọ gēme ka ha ma jijiji:
6 Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ikeN'elu Zaion, bú ugwu nsọm.
7 M'gākọ akukọ bayere ukpuru:Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu;Mu onwem amuwo gi ta.
8 Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi,Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.
9 I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha;Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.