5 Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi:Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.
6 N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi:I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.
7 N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi,Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya.
8 Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile:Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì.
9 I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi:Jehova gēloda ha n'iwe-Ya,Ọku gēripia kwa ha.
10 I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì,Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu.
11 N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi:Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.