16 N'ihi na nkita dim buruburu:Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu;Ha nādupú akam abua na ukwum abua.
17 Anamagu ọkpukpum nile ọnu;Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:
18 Ha nēkère onwe-ha uwem,N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.
19 Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya:Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.
20 Naputa nkpuru-obim na mma-agha;Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.
21 Zọputam n'ọnu ọdum;Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.
22 Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi:N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.