20 Naputa nkpuru-obim na mma-agha;Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.
21 Zọputam n'ọnu ọdum;Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.
22 Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi:N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.
23 Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya;Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya;Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel.
24 N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú;O zonarighi kwa ya iru-Ya;Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.
25 N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba:M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.
26 Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ:Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya:Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.