1 Jehova nwe uwa na ùjú-ya;Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.
2 N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile,Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile.
3 Ònye gārigo n'ugwu Jehova?Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?
4 Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha;Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu,Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.
5 Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova,Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.