13 Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.
14 Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.
15 Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.
16 Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.
17 Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.
18 Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.
19 Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.