17 Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.
18 Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.
19 Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.
20 Debe nkpuru-obim, naputakwam:Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.
21 Ka izu-okè na izi-ezi chezim,N'ihi na elewom anya Gi.