2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam;Nucha akurum abua na obim.
3 N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam;Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.
4 Mu na madu efu anọkọghi;Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.
5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.
6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:
7 Ime ka ege nti olu ekele,Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya,Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.