1 Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba!Ọtutu madu nēbili imegidem.
2 Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si,Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.
3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum,Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.
4 Ejim olum kpọkue Jehova,O we zam site n'ugwu nsọ Ya.