1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya.
2 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume,Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya.
3 Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nkáSite n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.
4 N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum:Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru. Selah