15 Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.
16 Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ,Ibipu ncheta-ha n'uwa.
17 Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru,We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.
18 Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa,Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.
19 Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume:Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.
20 Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile:Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.
21 Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua:Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.