5 Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.
6 Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.
7 Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,Ọ we dọputa ha.
8 Detunu ire, hu na Jehova di nma:Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.
9 Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.
10 Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.
11 Bianu, umum, gem nti:Egwu Jehova ka m'gēzi unu.