20 N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.
21 Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem;Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.
22 I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti:Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.
23 Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.
24 Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.
25 Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.
26 Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim:Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.