4 Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya;Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma;Ọ dighi-aju ihe ọjọ.
5 Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di;Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé.
6 Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke;Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne:Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.
7 Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke!Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua.
8 Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi;Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.
9 N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di:N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.
10 Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi;Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi.