17 N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.
18 Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.
19 Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.
20 N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.
21 Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.
22 N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
23 Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.