20 N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.
21 Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.
22 N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
23 Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.
24 Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.
25 Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
26 Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.