1 Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi:Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2 N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom,Aka-Gi adakwasiwokwam.
3 Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi;Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.
4 N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim:Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.