5 Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri,N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ.
6 Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku;Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.
7 N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.
8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.
9 Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;Ize-umem ezonarighi kwa Gi.
10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.
11 Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.