7 N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku;Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum.
8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku:Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.
9 Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di;Ize-umem ezonarighi kwa Gi.
10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la:Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum.
11 Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim;Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.
12 Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà;Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche,Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.
13 Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe;Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.