1 Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya,Ka m'we ghara iwere irem mehie:Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu,Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum.
2 Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe;Ewe kpalie ihe-nb͕um.
3 Obim di ọku nimem;Mb͕e m'nātughari uche ọku rebere:M'we were irem kwue okwu:
4 Jehova, me ka m'mara ọgwugwum,Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu;Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi.