4 Jehova, me ka m'mara ọgwugwum,Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu;Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi.
5 Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka;Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi:N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah
6 N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari:N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara:Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha.
7 Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini?Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di.
8 Naputam n'aka njehiem nile:Emelam ka m'buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu.
9 Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum;N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.
10 Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi:Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.