2 Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya;I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.
3 N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu,Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha:Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi,N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.
4 Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke:Nye nzọputa nile nke Jekob iwu.
5 Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi:Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.
6 N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi,Mma-agham adighi-azọputakwam.
7 Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi,I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì.
8 Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah