5 Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi:Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.
6 N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi,Mma-agham adighi-azọputakwam.
7 Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi,I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì.
8 Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah
9 Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere;I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha.
10 I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu:Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha.
11 I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri;N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.