2 N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe,Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri;
3 Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu,Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya. Selah
4 Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu,Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu.
5 Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya:Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.
6 Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha:O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.
7 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi;Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah
8 Jenu, hu ọlu nile nke Jehova,Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa,