2 N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu;Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.
3 Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi,Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.
4 Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi,Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah
5 Chineke ewerewo iti-nkpu rigo,Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.
6 Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma:Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.
7 N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu:Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.
8 Chineke aghọwo eze mba nile:Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.