1 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku,N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya.
2 Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile,Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu,Bú obodo Eze ukwu.
3 Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.
4 N'ihi na, le, ndi-eze zukọro,Ha gabigara n'otù.
5 Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru;Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.