2 Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile,Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu,Bú obodo Eze ukwu.
3 Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.
4 N'ihi na, le, ndi-eze zukọro,Ha gabigara n'otù.
5 Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru;Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.
6 Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu;Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.
7 I ji ifufe Iru-anyanwuTiwa ub͕ọ nile nke Tashish.
8 Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworoN'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi:Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah