7 I ji ifufe Iru-anyanwuTiwa ub͕ọ nile nke Tashish.
8 Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworoN'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi:Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah
9 Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke,N'etiti ulo uku Gi.
10 Dika aha-Gi si di, Chineke,Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa:Ezi omume juputara aka-nri-Gi.
11 Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu,Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù,N'ihi ikpé-Gi nile.
12 Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu:Guanu ulo-elu-ya nile ọnu.
13 Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya,Tulenu ulo nile ya di elu;Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu.