1 Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo,We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
2 Site na Zaion, bú ebe mazuru nma,Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.
3 Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti:Ọku nēripia n'iru Ya,Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
4 Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù,Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:
5 Chikọtaranum ndi-eberem;Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.
6 Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya;N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah
7 Nuru, ndim, M'gēkwu kwa;Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi:Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.