12 Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13 M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14 Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:
15 Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
16 Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?
17 Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,We tufue okwum nile n'azu gi.
18 Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.