8 Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba;Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
9 M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi,M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.
10 N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11 Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.
12 Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13 M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14 Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere: